2 Samuel 20

Mgbe ahụ, otu onye okwu na ụka, aha ya bụ Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin nọ nʼebe ahụ nʼoge a. Ọ fụrụ opi ike ya tie mkpu sị, “Anyị enweghị oke nʼime Devid, anyị enwekwaghị ihe nketa nʼime nwa Jesi. Ndị Izrel, onye ọbụla laa nʼụlọ ikwu ya!”

2 Samuel 20:1 (UKJV) And there happened to be there a man of Belial, whose name was Sheba, the son of Bichri, a Benjamite: and he blew a trumpet, and said, We have no part in David, neither have we inheritance in the son of Jesse: every man to his tents, O Israel.

1Mgbe ahụ, otu onye okwu na ụka, aha ya bụ Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin nọ nʼebe ahụ nʼoge a. Ọ fụrụ opi ike ya tie mkpu sị, “Anyị enweghị oke nʼime Devid, anyị enwekwaghị ihe nketa nʼime nwa Jesi. Ndị Izrel, onye ọbụla laa nʼụlọ ikwu ya!”

2Ya mere, ndị ikom Izrel niile tụgharịrị hapụ Devid, soro Sheba nwa Bikri. Ma ndị ikom Juda nọgidere soro eze ha site na Jọdan ruo Jerusalem.

3Mgbe Devid lọghachitere nʼụlọ ya na Jerusalem. O nyere iwu ka ndị iko ya nwanyị iri ndị ahụ ọ hapụrụ ilekọta ụlọ, ndị ahụ ha na Absalọm dinara, nọrọ nʼụlọ dị iche, ebe a nọ na-eche ha nche. Eze abakwurughị ha ọzọ. Ha bụ ndị emechibidoro ụzọ, ha na-ebi ndụ dịka ndị di ha nwụrụ anwụ tutu ruo ụbọchị ọnwụ ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.