2 Samuel 20

Mgbe Devid lọghachitere nʼụlọ ya na Jerusalem. O nyere iwu ka ndị iko ya nwanyị iri ndị ahụ ọ hapụrụ ilekọta ụlọ, ndị ahụ ha na Absalọm dinara, nọrọ nʼụlọ dị iche, ebe a nọ na-eche ha nche. Eze abakwurughị ha ọzọ. Ha bụ ndị emechibidoro ụzọ, ha na-ebi ndụ dịka ndị di ha nwụrụ anwụ tutu ruo ụbọchị ọnwụ ha.

2 Samuel 20:3 (UKJV) And David came to his house at Jerusalem; and the king took the ten women his concubines, whom he had left to keep the house, and put them in ward, and fed them, but went not in unto them. So they were shut up unto the day of their death, living in widowhood.

1Mgbe ahụ, otu onye okwu na ụka, aha ya bụ Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin nọ nʼebe ahụ nʼoge a. Ọ fụrụ opi ike ya tie mkpu sị, “Anyị enweghị oke nʼime Devid, anyị enwekwaghị ihe nketa nʼime nwa Jesi. Ndị Izrel, onye ọbụla laa nʼụlọ ikwu ya!”

2Ya mere, ndị ikom Izrel niile tụgharịrị hapụ Devid, soro Sheba nwa Bikri. Ma ndị ikom Juda nọgidere soro eze ha site na Jọdan ruo Jerusalem.

3Mgbe Devid lọghachitere nʼụlọ ya na Jerusalem. O nyere iwu ka ndị iko ya nwanyị iri ndị ahụ ọ hapụrụ ilekọta ụlọ, ndị ahụ ha na Absalọm dinara, nọrọ nʼụlọ dị iche, ebe a nọ na-eche ha nche. Eze abakwurughị ha ọzọ. Ha bụ ndị emechibidoro ụzọ, ha na-ebi ndụ dịka ndị di ha nwụrụ anwụ tutu ruo ụbọchị ọnwụ ha.

4Mgbe ahụ, eze gwara Amasa okwu sị, “Kpokọta ndị agha Juda ka ha bịakwute m nʼime abalị atọ. Gị onwe gị kwa ga-eso ha bịa nʼoge ahụ.”

5Amasa pụrụ jee ịkpọkọta ndị Juda; ma o were ya ọtụtụ oge karịa abalị atọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.