2 Samuel 20

Amasa elezighị anya hụ na mma agha nta dị nʼaka Joab. Joab mabanyere ya nʼime afọ Amasa, mee ka mgbịrị afọ ya sọsikwaa nʼala. Ọ maghị ya mma ahụ ugboro abụọ, nʼihi na otu ugboro ahụ mere ka Amasa nwụọ. Mgbe ahụ, Joab na nwanne ya Abishai chụsoro Sheba nwa Bikri nʼazụ.

2 Samuel 20:10 (UKJV) But Amasa took no heed to the sword that was in Joab's hand: so he stroke him therewith in the fifth rib, and shed out his bowels to the ground, and struck him not again; and he died. So Joab and Abishai his brother pursued after Sheba the son of Bichri.

8Mgbe ha rutere nʼoke nkume ahụ dị na Gibiọn, Amasa pụtara izute ha. Joab yi uwe agha ya nʼoge a; ọ fanyekwara mma agha ya nʼọbọ nʼukwu ya. Mgbe ọ gara nʼihu, mma ahụ si nʼọbọ ya dapụta.

9Joab kelere Amasa sị ya, “Kedụ ka ị dị nwanna m.” Mgbe ahụ, Joab ji aka nri ya jide Amasa nʼahụọnụ isutu ya ọnụ,

10Amasa elezighị anya hụ na mma agha nta dị nʼaka Joab. Joab mabanyere ya nʼime afọ Amasa, mee ka mgbịrị afọ ya sọsikwaa nʼala. Ọ maghị ya mma ahụ ugboro abụọ, nʼihi na otu ugboro ahụ mere ka Amasa nwụọ. Mgbe ahụ, Joab na nwanne ya Abishai chụsoro Sheba nwa Bikri nʼazụ.

11Mgbe ahụ, otu nʼime ndị agha Joab guzo nʼakụkụ Amasa sị, “Onye ọbụla dịnyeere Joab na Devid ya bịa soro Joab nʼazụ.”

12Ma Amasa tọgbọ nʼala nʼetiti ụzọ. Ọbara sikwa ya nʼahụ na-asọpụta. Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọtụtụ ndị agha na-agbakọ ile Amasa, o bupụrụ ozu ya nʼụzọ, were uwe kpuchie ya nʼọhịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.