2 Samuel 20

Ma Amasa tọgbọ nʼala nʼetiti ụzọ. Ọbara sikwa ya nʼahụ na-asọpụta. Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọtụtụ ndị agha na-agbakọ ile Amasa, o bupụrụ ozu ya nʼụzọ, were uwe kpuchie ya nʼọhịa.

2 Samuel 20:12 (UKJV) And Amasa wallowed in blood in the midst of the highway. And when the man saw that all the people stood still, he removed Amasa out of the highway into the field, and cast a cloth upon him, when he saw that every one that came by him stood still.

10Amasa elezighị anya hụ na mma agha nta dị nʼaka Joab. Joab mabanyere ya nʼime afọ Amasa, mee ka mgbịrị afọ ya sọsikwaa nʼala. Ọ maghị ya mma ahụ ugboro abụọ, nʼihi na otu ugboro ahụ mere ka Amasa nwụọ. Mgbe ahụ, Joab na nwanne ya Abishai chụsoro Sheba nwa Bikri nʼazụ.

11Mgbe ahụ, otu nʼime ndị agha Joab guzo nʼakụkụ Amasa sị, “Onye ọbụla dịnyeere Joab na Devid ya bịa soro Joab nʼazụ.”

12Ma Amasa tọgbọ nʼala nʼetiti ụzọ. Ọbara sikwa ya nʼahụ na-asọpụta. Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọtụtụ ndị agha na-agbakọ ile Amasa, o bupụrụ ozu ya nʼụzọ, were uwe kpuchie ya nʼọhịa.

13Mgbe e bupụsịrị ozu Amasa nʼụzọ, ndị agha niile sooro Joab gaa ijide Sheba, nwa Bikri.

14Sheba gabigara ebo niile nke Izrel ruo Ebel-Bet-Maaka, gabigakwa oke ala ndị Bikri, bụ ndị zukọtara soro ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.