12Ma Amasa tọgbọ nʼala nʼetiti ụzọ. Ọbara sikwa ya nʼahụ na-asọpụta. Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọtụtụ ndị agha na-agbakọ ile Amasa, o bupụrụ ozu ya nʼụzọ, were uwe kpuchie ya nʼọhịa.
13Mgbe e bupụsịrị ozu Amasa nʼụzọ, ndị agha niile sooro Joab gaa ijide Sheba, nwa Bikri.
14Sheba gabigara ebo niile nke Izrel ruo Ebel-Bet-Maaka, gabigakwa oke ala ndị Bikri, bụ ndị zukọtara soro ya.
15Ndị agha Joab bịara gbochie ya na Ebel-Bet-Maaka. Ha wuru ihe mgbochi ruo obodo ahụ, nọbichie mgbidi dị ya gburugburu. Ebe ha nọ na-akụ mgbidi ahụ ihe, ka ha kwatuo ya.
16Otu nwanyị maara ihe si nʼobodo ahụ kpọọ oku sị, “Geenụ m ntị, geenụ m ntị, gwanụ Joab ka ọ bịa nʼebe a. Achọrọ m ịgwa ya okwu.”