14Sheba gabigara ebo niile nke Izrel ruo Ebel-Bet-Maaka, gabigakwa oke ala ndị Bikri, bụ ndị zukọtara soro ya.
15Ndị agha Joab bịara gbochie ya na Ebel-Bet-Maaka. Ha wuru ihe mgbochi ruo obodo ahụ, nọbichie mgbidi dị ya gburugburu. Ebe ha nọ na-akụ mgbidi ahụ ihe, ka ha kwatuo ya.
16Otu nwanyị maara ihe si nʼobodo ahụ kpọọ oku sị, “Geenụ m ntị, geenụ m ntị, gwanụ Joab ka ọ bịa nʼebe a. Achọrọ m ịgwa ya okwu.”
17Joab pụtara gaa ya nso. Nwanyị ahụ jụrụ sị, “Ọ bụ gị bụ Joab?” Ọ zara sị, “E, ọ bụ m.” Mgbe ahụ, ọ gwara ya, “Gee ntị, ka i nụ ihe ohu gị nwere ikwu.” Joab sịrị ya, “Ana m ege ntị.”
18Ọ gara nʼihu sị, “Nʼoge ochie a na-ekwu sị, ‘Gaa jụta ase nʼEbel,’ nʼụzọ dị otu a ka ha si ekwubi okwu.