22Nwanyị ahụ ji ndụmọdụ nke amamihe ya gakwuru ndị obodo. Ha bipụrụ Sheba nwa Bikri isi, tụpụtara ya Joab. Ya mere na ọ fụrụ opi ike ya, ndị ikom ya sitere nʼobodo ahụ lasaa, onye ọbụla lara nʼụlọ nke ya. Joab laghachikwuru eze na Jerusalem.
23Ọ bụ Joab ka e mere onyeisi agha na-achị ndị agha niile nke Izrel. Benaya nwa Jehoiada bụ onye na-achịkọta ndị Keret na ndị Pelet na-eche eze nche.
24Adoniram na-ahụ maka ihe banyere ndị ọrụ mmanye. Jehoshafat nwa Ahilud bụ onye na-edekọta ihe niile na-eme nʼobodo.
25Sheva bụ ode akwụkwọ eze, Zadọk na Abịata bụ ndị nchụaja.
26Ira, onye si nʼobodo Jaịa, bụ onye nchụaja eze Devid.