2 Samuel 21

Ụnwụ dara afọ atọ nʼoge Devid na-achị, afọ kwa afọ. Devid chọrọ ihu Onyenwe anyị. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Ọ bụ maka Sọl na ọbara ụlọ ya kwafuru, nʼihi na o gburu ndị Gibiọn.”

2 Samuel 21:1 (UKJV) Then there was a famine in the days of David three years, year after year; and David enquired of the LORD. And the LORD answered, It is for Saul, and for his bloody house, because he slew the Gibeonites.

1Ụnwụ dara afọ atọ nʼoge Devid na-achị, afọ kwa afọ. Devid chọrọ ihu Onyenwe anyị. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Ọ bụ maka Sọl na ọbara ụlọ ya kwafuru, nʼihi na o gburu ndị Gibiọn.”

2Eze kpọrọ ndị Gibiọn, gwa ha okwu. (Ndị Gibiọn abụghị ndị Izrel, kama ha bụ ndị fọdụrụ nʼime ndị Amọrait, ndị bi nʼala Kenan mgbe ụmụ Izrel batara. Mgbe ahụ ha batara, ndị Izrel ṅụrụ iyi nye ndị Gibiọn na ha agaghị egbu ha, ma Sọl sitere nʼịnụ ọkụ nke obi nʼihi Izrel na Juda chọọ ikpochapụ ha.)

3Devid jụrụ ndị Gibiọn ajụjụ sị, “Gịnị ka m ga-emere unu? Gịnị ka m ga-eji kpuchie mmehie a e mere megide unu, ime ka unu gọzie ihe nketa Onyenwe anyị?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.