2 Samuel 21

Mgbe a gwara Devid ihe Rizpa, nwa nwanyị Aịa, iko nwanyị Sọl mere,

2 Samuel 21:11 (UKJV) And it was told David what Rizpah the daughter of Aiah, the concubine of Saul, had done.

9O nyefere ha niile nʼaka ndị Gibiọn; ndị Gibiọn kwụbakwara ha nʼugwu nʼihu Onyenwe anyị. Ha asaa nwụrụ nʼotu ụbọchị na mmalite owuwe ihe ubi nke ọka balị.

10Ma Rizpa, nwa nwanyị Aịa were akwa mkpe gbasara onwe ya nʼelu nkume. O kweghịkwa ka anụ ufe bekwasị ha nʼehihie, maọbụ anụ ọhịa nʼabalị. Ọ nọgidere nʼebe ahụ site nʼoge mmalite owuwe ihe ubi tutu ruo mgbe mmiri bidoro izokwasị anụ ahụ ha.

11Mgbe a gwara Devid ihe Rizpa, nwa nwanyị Aịa, iko nwanyị Sọl mere,

12ọ gara chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya Jonatan site nʼaka ndị nwe obodo Jebesh Gilead. Ha gara na nzuzo zuru ozu Sọl na Jonatan site nʼama dị na Bet-Shan, ebe ndị Filistia kwụbara ha, oge ha gburu Sọl na Gilboa.

13Devid sitere nʼebe ahụ chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan, chịkọtaakwa ọkpụkpụ ndị ahụ akwụgburu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.