2 Samuel 21

O nyefere ha niile nʼaka ndị Gibiọn; ndị Gibiọn kwụbakwara ha nʼugwu nʼihu Onyenwe anyị. Ha asaa nwụrụ nʼotu ụbọchị na mmalite owuwe ihe ubi nke ọka balị.

2 Samuel 21:9 (UKJV) And he delivered them into the hands of the Gibeonites, and they hanged them in the hill before the LORD: and they fell all seven together, and were put to death in the days of harvest, in the first days, in the beginning of barley harvest.

7Ma eze nwere ọmịiko nʼahụ Mefiboshet nwa Jonatan, nwa Sọl, nʼihi ịgba ndụ dị nʼetiti ya na Jonatan nʼihu Onyenwe anyị.

8Ma eze kpọọrọ Amoni na Mefiboshet, ụmụ ndị ikom abụọ nke Rizpa, nwa nwanyị Aịa, bụ ndị ọ mụtaara Sọl. Nakwa ụmụ ndị ikom ise nke Merab nwa Sọl mụtara mgbe ọ bụ nwunye Adriel, nwa Bazilai onye Mehola.

9O nyefere ha niile nʼaka ndị Gibiọn; ndị Gibiọn kwụbakwara ha nʼugwu nʼihu Onyenwe anyị. Ha asaa nwụrụ nʼotu ụbọchị na mmalite owuwe ihe ubi nke ọka balị.

10Ma Rizpa, nwa nwanyị Aịa were akwa mkpe gbasara onwe ya nʼelu nkume. O kweghịkwa ka anụ ufe bekwasị ha nʼehihie, maọbụ anụ ọhịa nʼabalị. Ọ nọgidere nʼebe ahụ site nʼoge mmalite owuwe ihe ubi tutu ruo mgbe mmiri bidoro izokwasị anụ ahụ ha.

11Mgbe a gwara Devid ihe Rizpa, nwa nwanyị Aịa, iko nwanyị Sọl mere,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.