2 Samuel 21

Ha zara eze sị, “Kwere ka anyị wezuga nwoke ahụ wetaara anyị mbibi na ịla nʼiyi, onye ahụ mere ka anyị ghara inwe ebe obibi ọbụla nʼala Izrel.

2 Samuel 21:5 (UKJV) And they answered the king, The man that consumed us, and that devised against us that we should be destroyed from remaining in any of the coasts of Israel,

3Devid jụrụ ndị Gibiọn ajụjụ sị, “Gịnị ka m ga-emere unu? Gịnị ka m ga-eji kpuchie mmehie a e mere megide unu, ime ka unu gọzie ihe nketa Onyenwe anyị?”

4Ndị Gibiọn zara ya sị, “Nsogbu anyị na Sọl na ndị ụlọ ya abụghị ihe a ga-eji ọlaọcha maọbụ ọlaedo mezie. Anyị achọkwaghị ka onye ọbụla nʼIzrel nwụọ nʼihi anyị.” Devid sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?”

5Ha zara eze sị, “Kwere ka anyị wezuga nwoke ahụ wetaara anyị mbibi na ịla nʼiyi, onye ahụ mere ka anyị ghara inwe ebe obibi ọbụla nʼala Izrel.

6Ka akpọnye anyị ndị ikom asaa site nʼụmụ ya, ka anyị kwụgbuo ha nye Onyenwe anyị na Gibea Sọl, onye Onyenwe anyị họpụtara.” Eze zara sị, “Aga m akpọnye unu ha.”

7Ma eze nwere ọmịiko nʼahụ Mefiboshet nwa Jonatan, nwa Sọl, nʼihi ịgba ndụ dị nʼetiti ya na Jonatan nʼihu Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.