2 Samuel 3

Ngwangwa, Abna zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Devid sị ya, “Onye nwee ala a? Ka mụ na gị gbaa ndụ. Aga m enyere gị aka kpọghachite ndị Izrel ka ha dịnyeere gị.”

2 Samuel 3:12 (UKJV) And Abner sent messengers to David on his behalf, saying, Whose is the land? saying also, Make your league with me, and, behold, my hand shall be with you, to bring about all Israel unto you.

10Ịnapụ ụlọ Sọl alaeze ahụ, na ime ka ocheeze Devid guzosie ike nʼebe Izrel niile na Juda niile nọ, site na Dan ruo Bịasheba.”

11Ishboshet ekwughị ihe ọbụla nʼihi na ọ na-atụ Abna egwu.

12Ngwangwa, Abna zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Devid sị ya, “Onye nwee ala a? Ka mụ na gị gbaa ndụ. Aga m enyere gị aka kpọghachite ndị Izrel ka ha dịnyeere gị.”

13Devid sịrị, “Ọ dị mma. Mụ na unu ga-agba ndụ. Ma ọ dị otu ihe m chọrọ nʼaka unu. Unu agaghị ahụ ihu m anya ma ọ bụrụ na unu eduteghị Mikal, nwa Sọl, mgbe unu ga-abịa ịhụ m.”

14Devid ziri Ishboshet nwa Sọl ozi sị ya, “Dulatara m nwunye m Mikal, nʼihi na ọ bụ narị apị ndị Filistia ka m ji lụtara ya onwe m.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.