11Ishboshet ekwughị ihe ọbụla nʼihi na ọ na-atụ Abna egwu.
12Ngwangwa, Abna zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Devid sị ya, “Onye nwee ala a? Ka mụ na gị gbaa ndụ. Aga m enyere gị aka kpọghachite ndị Izrel ka ha dịnyeere gị.”
13Devid sịrị, “Ọ dị mma. Mụ na unu ga-agba ndụ. Ma ọ dị otu ihe m chọrọ nʼaka unu. Unu agaghị ahụ ihu m anya ma ọ bụrụ na unu eduteghị Mikal, nwa Sọl, mgbe unu ga-abịa ịhụ m.”
14Devid ziri Ishboshet nwa Sọl ozi sị ya, “Dulatara m nwunye m Mikal, nʼihi na ọ bụ narị apị ndị Filistia ka m ji lụtara ya onwe m.”
15Na-atụfughị oge, Ishboshet nyere iwu ka e site nʼaka di ya bụ Paltiel, nwa Laish, kpọpụta ya.