2 Samuel 3

Na-atụfughị oge, Ishboshet nyere iwu ka e site nʼaka di ya bụ Paltiel, nwa Laish, kpọpụta ya.

2 Samuel 3:15 (UKJV) And Ishbosheth sent, and took her from her husband, even from Phaltiel the son of Laish.

13Devid sịrị, “Ọ dị mma. Mụ na unu ga-agba ndụ. Ma ọ dị otu ihe m chọrọ nʼaka unu. Unu agaghị ahụ ihu m anya ma ọ bụrụ na unu eduteghị Mikal, nwa Sọl, mgbe unu ga-abịa ịhụ m.”

14Devid ziri Ishboshet nwa Sọl ozi sị ya, “Dulatara m nwunye m Mikal, nʼihi na ọ bụ narị apị ndị Filistia ka m ji lụtara ya onwe m.”

15Na-atụfughị oge, Ishboshet nyere iwu ka e site nʼaka di ya bụ Paltiel, nwa Laish, kpọpụta ya.

16Mgbe ha du ya na-aga, Paltiel sogidere ya nʼazụ na-akwa akwa tutu ha eruo Bahurim. Nʼebe ahụ ka Abna nọ sị ya, “Laghachi ugbu a.” Ọ tụgharịrị laa.

17Abna na ndị okenye Izrel kparịtara ụka. Ọ chetaara ha sị ha, “Ọ dịla anya kemgbe unu na-achọ ka Devid bụrụ eze unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.