2 Samuel 3

Abna na ndị okenye Izrel kparịtara ụka. Ọ chetaara ha sị ha, “Ọ dịla anya kemgbe unu na-achọ ka Devid bụrụ eze unu.

2 Samuel 3:17 (UKJV) And Abner had communication with the elders of Israel, saying, All of you sought for David in times past to be king over you:

15Na-atụfughị oge, Ishboshet nyere iwu ka e site nʼaka di ya bụ Paltiel, nwa Laish, kpọpụta ya.

16Mgbe ha du ya na-aga, Paltiel sogidere ya nʼazụ na-akwa akwa tutu ha eruo Bahurim. Nʼebe ahụ ka Abna nọ sị ya, “Laghachi ugbu a.” Ọ tụgharịrị laa.

17Abna na ndị okenye Izrel kparịtara ụka. Ọ chetaara ha sị ha, “Ọ dịla anya kemgbe unu na-achọ ka Devid bụrụ eze unu.

18Ugbu a meenụ ya, nʼihi na Onyenwe anyị kweere Devid nkwa, ‘Site nʼaka ohu m bụ Devid ka m ga-esi zọpụta ndị m bụ Izrel site nʼaka ndị Filistia, nakwa site nʼaka ndị iro ha niile.’ ”

19Abna gwakwara ndị Benjamin okwu. Emesịa, o jere Hebrọn ịgwa Devid ihe niile ndị Izrel na ndị Benjamin zubere ime.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.