2 Samuel 3

Ya mere Joab jekwuuru eze sị ya, “Gịnị ka i mere? Lee, Abna bịakwutere gị. Gịnị mere i ji hapụ ya ka ọ laa? Lee ya ugbu a, ọ laala!

2 Samuel 3:24 (UKJV) Then Joab came to the king, and said, What have you done? behold, Abner came unto you; why is it that you have sent him away, and he is quite gone?

22Nʼotu mgbe ahụ, ndị ikom Devid na Joab si nʼebe ha gara ịpụnara ndị mmadụ ihe lọta, bukọrọ ọtụtụ ihe nkwata. Ma Abna anọghịkwa na Hebrọn ya na Devid, nʼihi na Devid ezipụla ya, ọ pụọla nʼudo.

23Mgbe Joab na ndị agha ya lọtara, a kọọrọ ya na Abna, nwa Nea, bịara hụ eze, na ọ laakwala nʼudo.

24Ya mere Joab jekwuuru eze sị ya, “Gịnị ka i mere? Lee, Abna bịakwutere gị. Gịnị mere i ji hapụ ya ka ọ laa? Lee ya ugbu a, ọ laala!

25Ị maara onye Abna nwa Nea bụ? Ọ bịara ịghọ gị aghụghọ, na inyocha njegharị gị, ịchọpụta ihe niile ị na-eme.”

26Mgbe Joab si nʼihu Devid pụta, o zipụrụ ndị ozi ka ha sochie Abna azụ, gwa ya ka ọ laghachi. Ha hụrụ ya nʼolulu mmiri Sira. O sokwara ha laghachi, ma Devid amaghị ihe banyere nke a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.