23Mgbe Joab na ndị agha ya lọtara, a kọọrọ ya na Abna, nwa Nea, bịara hụ eze, na ọ laakwala nʼudo.
24Ya mere Joab jekwuuru eze sị ya, “Gịnị ka i mere? Lee, Abna bịakwutere gị. Gịnị mere i ji hapụ ya ka ọ laa? Lee ya ugbu a, ọ laala!
25Ị maara onye Abna nwa Nea bụ? Ọ bịara ịghọ gị aghụghọ, na inyocha njegharị gị, ịchọpụta ihe niile ị na-eme.”
26Mgbe Joab si nʼihu Devid pụta, o zipụrụ ndị ozi ka ha sochie Abna azụ, gwa ya ka ọ laghachi. Ha hụrụ ya nʼolulu mmiri Sira. O sokwara ha laghachi, ma Devid amaghị ihe banyere nke a.
27Mgbe Abna lọghachiri na Hebrọn, Joab duuru ya gaa nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, dịka ọ chọrọ ka ha kparịtaa ụka. Ngwangwa, ọ mịpụtara nwa mma ya, jiri ya magbuo Abna, nʼihi ịbọ ọbọ ọbara nwanne ya, bụ Asahel.