2 Samuel 3

Mgbe Joab na ndị agha ya lọtara, a kọọrọ ya na Abna, nwa Nea, bịara hụ eze, na ọ laakwala nʼudo.

2 Samuel 3:23 (UKJV) When Joab and all the host that was with him were come, they told Joab, saying, Abner the son of Ner came to the king, and he has sent him away, and he is gone in peace.

21Mgbe ahụ, Abna sịrị Devid, “Ka m gaa ngwangwa ga kpọkọtaa ndị Izrel niile, nye onyenwe m bụ eze, ka gị na ha gbaa ndụ, ka ị bụrụ eze ndị niile mkpụrụobi gị na-achọsi ike.” Ya mere Devid zilara Abna. Ọ laa nʼudo.

22Nʼotu mgbe ahụ, ndị ikom Devid na Joab si nʼebe ha gara ịpụnara ndị mmadụ ihe lọta, bukọrọ ọtụtụ ihe nkwata. Ma Abna anọghịkwa na Hebrọn ya na Devid, nʼihi na Devid ezipụla ya, ọ pụọla nʼudo.

23Mgbe Joab na ndị agha ya lọtara, a kọọrọ ya na Abna, nwa Nea, bịara hụ eze, na ọ laakwala nʼudo.

24Ya mere Joab jekwuuru eze sị ya, “Gịnị ka i mere? Lee, Abna bịakwutere gị. Gịnị mere i ji hapụ ya ka ọ laa? Lee ya ugbu a, ọ laala!

25Ị maara onye Abna nwa Nea bụ? Ọ bịara ịghọ gị aghụghọ, na inyocha njegharị gị, ịchọpụta ihe niile ị na-eme.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.