2 Samuel 9

Eze jụrụ ya sị, “Ọ dị onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Ọ bụrụ na ọ dị onye fọdụrụ, achọrọ m igosi ya ụdị obiọma Chineke na-egosi.” Ziba zara ya sị, “Otu nwa nwoke Jonatan, nke dara ngwụrọ nọ ndụ.”

2 Samuel 9:3 (UKJV) And the king said, Is there not yet any of the house of Saul, that I may show the kindness of God unto him? And Ziba said unto the king, Jonathan has yet a son, which is lame on his feet.

1Otu ụbọchị, Devid jụrụ ajụjụ sị, “O nwere onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Achọrọ m igosi onye ahụ obi ebere nʼihi Jonatan.”

2Ọ nụrụ ihe banyere otu nwoke aha ya bụ Ziba, onye bụ otu nʼime ndị ohu Sọl. O ziri ozi ka a kpọọ ya. Mgbe ọ bịara nʼihu Devid, eze jụrụ ya sị, “Ọ bụ gị bụ Ziba?” Ọ zara sị, “E, onyenwe m, ọ bụ m ohu gị.”

3Eze jụrụ ya sị, “Ọ dị onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Ọ bụrụ na ọ dị onye fọdụrụ, achọrọ m igosi ya ụdị obiọma Chineke na-egosi.” Ziba zara ya sị, “Otu nwa nwoke Jonatan, nke dara ngwụrọ nọ ndụ.”

4Eze jụrụ, “Ebee ka ọ nọ?” Ziba zaghachiri, “Ọ nọ na Lo Deba, nʼụlọ Makia, nwa Amiel.”

5Ya mere eze Devid ziri ka e site nʼobodo Lo Deba, nʼụlọ Makia nwa Amiel kpọta ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.