2 Ndị Tesalonaịka 1

nʼụbọchị ahụ ọ ga-abịa ịnara ịja mma na otuto, nʼime ndị nsọ ya, ya na ka ọ bụrụ ihe ịtụnanya nʼebe ndị kweerenụ nọ, nʼihi na unu kwenyere ama nke oziọma ahụ anyị gbaara unu.

2 Thessalonians 1:10 (UKJV) When he shall come to be glorified in his saints, and to be admired in all them that believe (because our testimony among you was believed) in that day.

8Ọ ga-abịa nʼụdị ire ọkụ taa ndị ahụ na-amaghị Chineke ahụhụ na ndị jụrụ ịnabata oziọma nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.

9Ndị a ga-ata ahụhụ mbibi ruo ebighị ebi, ebe ha na-agaghị ahụ ihu Onyenwe anyị na ebube nke ike ya,

10nʼụbọchị ahụ ọ ga-abịa ịnara ịja mma na otuto, nʼime ndị nsọ ya, ya na ka ọ bụrụ ihe ịtụnanya nʼebe ndị kweerenụ nọ, nʼihi na unu kwenyere ama nke oziọma ahụ anyị gbaara unu.

11Nʼihi nke a, anyị na-anọgide nʼekpere nʼihi unu, na-arịọ ka Chineke gụọ unu dịka ndị kwesiri ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu, na-arịọkwa ka o site nʼike ya mee ka unu mezuo ebumnobi nke ihe dị mma, na ezi ọrụ niile nke okwukwe.

12Ka e nye aha Onyenwe anyị Jisọs otuto nʼime unu, unu onwe unu nʼime ya kwa, dị ka amara nke Chineke anyị na nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst si dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.