2 Ndị Tesalonaịka 1

Ndị a ga-ata ahụhụ mbibi ruo ebighị ebi, ebe ha na-agaghị ahụ ihu Onyenwe anyị na ebube nke ike ya,

2 Thessalonians 1:9 (UKJV) Who shall be punished with everlasting destruction from the presence of the Lord, and from the glory of his power;

7Ọ ga-enyekwa unu bụ ndị a na-akpagbu na anyị onwe anyị ezumike. Ọ ga-eme nke a mgbe a ga-eme ka Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị mmụọ ozi si nʼeluigwe pụta ìhè.

8Ọ ga-abịa nʼụdị ire ọkụ taa ndị ahụ na-amaghị Chineke ahụhụ na ndị jụrụ ịnabata oziọma nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.

9Ndị a ga-ata ahụhụ mbibi ruo ebighị ebi, ebe ha na-agaghị ahụ ihu Onyenwe anyị na ebube nke ike ya,

10nʼụbọchị ahụ ọ ga-abịa ịnara ịja mma na otuto, nʼime ndị nsọ ya, ya na ka ọ bụrụ ihe ịtụnanya nʼebe ndị kweerenụ nọ, nʼihi na unu kwenyere ama nke oziọma ahụ anyị gbaara unu.

11Nʼihi nke a, anyị na-anọgide nʼekpere nʼihi unu, na-arịọ ka Chineke gụọ unu dịka ndị kwesiri ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu, na-arịọkwa ka o site nʼike ya mee ka unu mezuo ebumnobi nke ihe dị mma, na ezi ọrụ niile nke okwukwe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.