5Ihe ndị a niile na-egosi na ikpe Chineke bụ nke ziri ezi, nke e ji eme unu ndị kwesiri alaeze Chineke, nke unu na-ata ahụhụ nʼihi ya.
6Chineke bụ onye ezi omume nʼezie. Ọ ga-eji mkpagbu kwụghachi ndị na-akpagbu unu.
7Ọ ga-enyekwa unu bụ ndị a na-akpagbu na anyị onwe anyị ezumike. Ọ ga-eme nke a mgbe a ga-eme ka Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị mmụọ ozi si nʼeluigwe pụta ìhè.
8Ọ ga-abịa nʼụdị ire ọkụ taa ndị ahụ na-amaghị Chineke ahụhụ na ndị jụrụ ịnabata oziọma nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
9Ndị a ga-ata ahụhụ mbibi ruo ebighị ebi, ebe ha na-agaghị ahụ ihu Onyenwe anyị na ebube nke ike ya,