2 Ndị Tesalonaịka 1

Ihe ndị a niile na-egosi na ikpe Chineke bụ nke ziri ezi, nke e ji eme unu ndị kwesiri alaeze Chineke, nke unu na-ata ahụhụ nʼihi ya.

2 Thessalonians 1:5 (UKJV) Which is a manifest token of the righteous judgment of God, that all of you may be counted worthy of the kingdom of God, for which all of you also suffer:

3Ụmụnna, anyị aghaghị ikele Chineke ekele mgbe niile banyere unu. O kwesiri ka anyị mee otu a, nʼihi okwukwe unu na-abawanye. Ịhụnanya onye ọbụla nʼime unu nwere nʼebe ibe ya nọ na-abawanyekwa.

4Nʼihi nke a, anyị na-eji unu na-anya isi nʼetiti nzukọ Chineke niile. Anyị na-akọrọ ha otu unu si jiri ntachiobi nọgidesie ike nʼime nsogbu niile dakwasịrị unu, na otu unu si nwee okwukwe dị ukwuu, ọ bụladị nʼetiti oke mkpagbu a na-akpagbu unu.

5Ihe ndị a niile na-egosi na ikpe Chineke bụ nke ziri ezi, nke e ji eme unu ndị kwesiri alaeze Chineke, nke unu na-ata ahụhụ nʼihi ya.

6Chineke bụ onye ezi omume nʼezie. Ọ ga-eji mkpagbu kwụghachi ndị na-akpagbu unu.

7Ọ ga-enyekwa unu bụ ndị a na-akpagbu na anyị onwe anyị ezumike. Ọ ga-eme nke a mgbe a ga-eme ka Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị mmụọ ozi si nʼeluigwe pụta ìhè.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.