15Ya mere, ụmụnna, nọgidenụ nʼozizi ahụ anyị mere ka unu mụta site nʼozizi anyị ziri unu, maọbụ na akwụkwọ anyị deere unu.
16Ka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nʼonwe ya, na Chineke Nna anyị, onye hụrụ anyị nʼanya, site nʼamara ya nye anyị agbamume dị ebighị ebi na ezi olileanya,
17gbaa obi unu ume, ma mee ka unu guzosie ike nʼịrụ ọrụ na ikwukwa ihe niile dị mma.