1Nʼikpeazụ, ụmụnna, na-ekperenụ anyị ekpere ka ozi Onyenwe anyị gaa nʼihu na-agbasa ruo ebe niile ma bụrụ ihe a na-asọpụrụ, dị ka ọ gbasara nʼetiti unu.
2Ka e nwee ike napụta anyị nʼaka ndị ajọ mmadụ, nʼihi na ọ bụghị mmadụ niile nwere okwukwe.
3Ma Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi, ọ ga-echebe unu ma gbaakwa unu ume ka unu hapụ ịdaba nʼaka ajọ onye ahụ.