Ọrụ Ndị Ozi 1

Ya mere, otu onye nʼime ndị anyị na ha nọ nʼoge niile Onyenwe anyị Jisọs nọ nʼetiti anyị,

Acts 1:21 (UKJV) Wherefore of these men which have companied with us all the time that the Lord Jesus went in and out among us,

19Ndị niile bi na Jerusalem nụrụ akụkọ banyere ya. Nʼihi ya, ha kpọrọ ala ahụ nʼasụsụ ha Akeldama, nke pụtara Ala Ọbara.

20Pita sịrị, “Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ Abụ Ọma: “ ‘Ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya,’ na, “ ‘Ka onye ọzọ nọchiekwa ọnọdụ ya ka onyeisi.’

21Ya mere, otu onye nʼime ndị anyị na ha nọ nʼoge niile Onyenwe anyị Jisọs nọ nʼetiti anyị,

22bido nʼoge Jọn na-eme baptizim ruo nʼụbọchị Jisọs si nʼetiti anyị rigoro nʼeluigwe. Otu onye nʼime ndị a ga-eso anyị bụrụ onye akaebe nke mbilite nʼọnwụ ya.”

23Ya mere, ha họpụtara mmadụ abụọ, Josef onye a na-akpọ Basabas (aha ya ọzọ bụkwa Jọstus) na Mataias.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.