Ọrụ Ndị Ozi 10

Nwoke a na ezinaụlọ ya bụ ndị na-asọpụrụ ma na-atụkwa egwu Chineke. Ọ na-enyere ndị ogbenye aka na-ekpekwara Chineke mgbe niile.

Acts 10:2 (UKJV) A devout man, and one that feared God with all his house, which gave much alms to the people, and prayed to God always.

1Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke bi na Sizaria, aha ya bụ Kọnelịọs. O bụ ọchịagha na-elekọta narị ndị agha si na mpaghara Itali.

2Nwoke a na ezinaụlọ ya bụ ndị na-asọpụrụ ma na-atụkwa egwu Chineke. Ọ na-enyere ndị ogbenye aka na-ekpekwara Chineke mgbe niile.

3Otu ụbọchị, nʼihe dịka elekere atọ nke ehihie, ọ hụrụ ọhụ ebe otu mmụọ ozi nke Chineke bịakwutere ya sị ya, “Kọnelịọs!”

4Kọnelịọs lekwasịrị ya anya nʼegwu jụọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụ gịnị?” Ọ sịrị ya, “Ekpere gị na onyinye gị nye ndị ogbenye e rutela dịka ihe ncheta nʼihu Chineke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.