14Ọ ga-ewetara gị ozi nke a ga-esite na ya zọpụta gị nʼezinaụlọ gị niile.’
15“Mgbe m ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ha dịka o siri bịakwasị anyị na mbụ.
16Mgbe ahụ, echetara m okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru sị, ‘Jọn ji mmiri mee unu baptizim, ma a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.’
17Ya mere, ọ bụrụ na Chineke nyere ha otu onyinye ahụ o nyere anyị mgbe anyị kweere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye ka m bụ iguzogide Chineke?”
18Mgbe ha nụrụ nke a, ha agaghị nʼihu nʼịrụ ụka kama ha toro Chineke, na-asị, “Nʼezie, Chineke enyela ohere ka ọ bụladị ndị mba ọzọ chegharịa baa na ndụ.”