16Mgbe ahụ, echetara m okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru sị, ‘Jọn ji mmiri mee unu baptizim, ma a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.’
17Ya mere, ọ bụrụ na Chineke nyere ha otu onyinye ahụ o nyere anyị mgbe anyị kweere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye ka m bụ iguzogide Chineke?”
18Mgbe ha nụrụ nke a, ha agaghị nʼihu nʼịrụ ụka kama ha toro Chineke, na-asị, “Nʼezie, Chineke enyela ohere ka ọ bụladị ndị mba ọzọ chegharịa baa na ndụ.”
19Ugbu a, ndị ahụ niile gbasasịrị nʼihi mkpagbu ahụ bidoro mgbe a tụgburu Stivin na nkume, jeruru akụkụ Fonisia na Saiprọs na Antiọk na-ekwusa oziọma ahụ naanị nʼetiti ndị Juu.
20Ma otu ọ dị, ụfọdụ nʼime ndị ikom ndị ahụ sitere nʼakụkụ Saiprọs na Sirini gara Antiọk, malite ikwusara ndị Griik oziọma banyere Onyenwe anyị Jisọs.