17Ya mere, ọ bụrụ na Chineke nyere ha otu onyinye ahụ o nyere anyị mgbe anyị kweere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye ka m bụ iguzogide Chineke?”
18Mgbe ha nụrụ nke a, ha agaghị nʼihu nʼịrụ ụka kama ha toro Chineke, na-asị, “Nʼezie, Chineke enyela ohere ka ọ bụladị ndị mba ọzọ chegharịa baa na ndụ.”
19Ugbu a, ndị ahụ niile gbasasịrị nʼihi mkpagbu ahụ bidoro mgbe a tụgburu Stivin na nkume, jeruru akụkụ Fonisia na Saiprọs na Antiọk na-ekwusa oziọma ahụ naanị nʼetiti ndị Juu.
20Ma otu ọ dị, ụfọdụ nʼime ndị ikom ndị ahụ sitere nʼakụkụ Saiprọs na Sirini gara Antiọk, malite ikwusara ndị Griik oziọma banyere Onyenwe anyị Jisọs.
21Onyenwe anyị gọziri mgbalị ha niile. Nʼihi na ọtụtụ mmadụ chegharịrị kwere nʼOnyenwe anyị.