20Nke a bụ ihe dị ka narị afọ anọ na iri afọ ise. “Mgbe nke a gasịrị, o nyere ha ndị ikpe dị iche iche ruo oge Samuel onye amụma.
21Mgbe ahụ ha rịọrọ ka enye ha eze, Chineke nyekwara ha Sọl, nwa Kish, onye si nʼagbụrụ Benjamin pụta, onye chịrị iri afọ anọ.
22Mgbe o wepụsịrị ya, o mere Devid ka ọ bụrụ eze ha. Ọ gbara ama banyere ya sị, ‘Achọtala m Devid nwa Jesi, nwoke nke dị ka ọchịchọ obi m nke si dị. Ọ bụkwa onye ga-eme ihe niile m chọrọ ka o mee.’
23“Jisọs onye si nʼezinaụlọ Devid pụta ka Chineke wetaara Izrel Onye nzọpụta ahụ bụ Jisọs, dịka o kwere nkwa izite.
24Ma tupu ọbịbịa ya, Jọn ekwusala nye ndị Izrel banyere baptizim nke nchegharị.