32“Anyị na-ezikwa unu oziọma a, nke nkwa ahụ Chineke kwere ndị nna nna anyị ha.
33O mezuola ha nye anyị bụ ụmụ ha, site na-ime ka Jisọs site nʼọnwụ bilie, dịka e dere ya nʼakwụkwọ Abụ ọma, “ ‘Ị bụ ọkpara m, taa abụrụla m nna gị.’
34Ma banyere ime ka o site nʼọnwụ bilie, ka ọ ghara ịlaghachi nʼire ure ọzọ. Nke a bụ ihe o kwuru, “ ‘Aga m emezuru gị nkwa nsọ ahụ niile m kwere Devid.’
35E dekwara ya nʼebe ọzọ nʼabụ ọma, “ ‘Ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure.’
36“Mgbe Devid rụzuru ọrụ Chineke chọrọ ka ọ rụọ nʼọgbọ ha, ọ nwụrụ, e likọọ ya na ndị nna nna ya ha o rekwara ure.