34Ma banyere ime ka o site nʼọnwụ bilie, ka ọ ghara ịlaghachi nʼire ure ọzọ. Nke a bụ ihe o kwuru, “ ‘Aga m emezuru gị nkwa nsọ ahụ niile m kwere Devid.’
35E dekwara ya nʼebe ọzọ nʼabụ ọma, “ ‘Ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure.’
36“Mgbe Devid rụzuru ọrụ Chineke chọrọ ka ọ rụọ nʼọgbọ ha, ọ nwụrụ, e likọọ ya na ndị nna nna ya ha o rekwara ure.
37Ma onye ahụ Chineke mere ka o site nʼọnwụ bilite erekwaghị ure.
38“Ya mere, ụmụnna m, achọrọ m ka o doo unu anya na mgbaghara mmehie dịkwa nʼime nwoke a, bụ Jisọs, anyị na-ekwusa nye unu.