36“Mgbe Devid rụzuru ọrụ Chineke chọrọ ka ọ rụọ nʼọgbọ ha, ọ nwụrụ, e likọọ ya na ndị nna nna ya ha o rekwara ure.
37Ma onye ahụ Chineke mere ka o site nʼọnwụ bilite erekwaghị ure.
38“Ya mere, ụmụnna m, achọrọ m ka o doo unu anya na mgbaghara mmehie dịkwa nʼime nwoke a, bụ Jisọs, anyị na-ekwusa nye unu.
39A na-esite na ya gụọ onye ọbụla kwere nʼonye ezi omume ọ bụladị site nʼihe ndị ahụ niile nke iwu Mosis na-apụghị ịgụ unu dị ka ndị ezi omume.
40Lezienụ anya ka ihe niile ndị amụma kwuru ghara ịdakwasị unu.