37Ma onye ahụ Chineke mere ka o site nʼọnwụ bilite erekwaghị ure.
38“Ya mere, ụmụnna m, achọrọ m ka o doo unu anya na mgbaghara mmehie dịkwa nʼime nwoke a, bụ Jisọs, anyị na-ekwusa nye unu.
39A na-esite na ya gụọ onye ọbụla kwere nʼonye ezi omume ọ bụladị site nʼihe ndị ahụ niile nke iwu Mosis na-apụghị ịgụ unu dị ka ndị ezi omume.
40Lezienụ anya ka ihe niile ndị amụma kwuru ghara ịdakwasị unu.
41“ ‘Lee, unu ndị na-akwa emo, nọrọnụ na mgbagwoju anya ma lakwanụ nʼiyi. Nʼihi na agaje m ime otu ihe nʼụbọchị unu nke unu na-agaghị ekwe na o mere, ọ bụladị na mmadụ kọrọ unu maka ya.’”