39A na-esite na ya gụọ onye ọbụla kwere nʼonye ezi omume ọ bụladị site nʼihe ndị ahụ niile nke iwu Mosis na-apụghị ịgụ unu dị ka ndị ezi omume.
40Lezienụ anya ka ihe niile ndị amụma kwuru ghara ịdakwasị unu.
41“ ‘Lee, unu ndị na-akwa emo, nọrọnụ na mgbagwoju anya ma lakwanụ nʼiyi. Nʼihi na agaje m ime otu ihe nʼụbọchị unu nke unu na-agaghị ekwe na o mere, ọ bụladị na mmadụ kọrọ unu maka ya.’”
42Mgbe Pọl na Banabas na-apụ, ndị mmadụ rịọrọ ha ka ha bịakwa nʼizu ụka ọzọ gwa ha okwu gbasara ihe ndị a.
43Mgbe a gbasara nzukọ ahụ, ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke sooro Pọl na Banabas, ndị gwara ha okwu, rịọsiekwa ha ike ka ha nọgide nʼamara Chineke.