Ọrụ Ndị Ozi 13

O mezuola ha nye anyị bụ ụmụ ha, site na-ime ka Jisọs site nʼọnwụ bilie, dịka e dere ya nʼakwụkwọ Abụ ọma, “ ‘Ị bụ ọkpara m, taa abụrụla m nna gị.’

Acts 13:33 (UKJV) God has fulfilled the same unto us their children, in that he has raised up Jesus again; as it is also written in the second psalm, You are my Son, this day have I begotten you.

31Ndị niile soro ya jegharịa site na Galili ruo Jerusalem hụkwara ya anya ọtụtụ ụbọchị. Ndị a bụkwa ndị na-agba ama nʼihu ndị mmadụ banyere ya.

32“Anyị na-ezikwa unu oziọma a, nke nkwa ahụ Chineke kwere ndị nna nna anyị ha.

33O mezuola ha nye anyị bụ ụmụ ha, site na-ime ka Jisọs site nʼọnwụ bilie, dịka e dere ya nʼakwụkwọ Abụ ọma, “ ‘Ị bụ ọkpara m, taa abụrụla m nna gị.’

34Ma banyere ime ka o site nʼọnwụ bilie, ka ọ ghara ịlaghachi nʼire ure ọzọ. Nke a bụ ihe o kwuru, “ ‘Aga m emezuru gị nkwa nsọ ahụ niile m kwere Devid.’

35E dekwara ya nʼebe ọzọ nʼabụ ọma, “ ‘Ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.