Ọrụ Ndị Ozi 13

Ma Sọl, onye aha ya bụkwa Pọl, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, legidere ya anya

Acts 13:9 (UKJV) Then Saul, (who also is called Paul,) filled with the Holy Spirit, set his eyes on him.

7Ya na otu onye ọchịchị obodo, aha ya bụ Sajiọs Pọlọs nọ. Ọ bụ nwoke nwere ọgụgụisi nʼebe ọ dị ukwuu, ọ kpọrọ Banabas na Sọl ka ha gwa ya okwu nke Chineke.

8Ma onye mgbaasị ahụ, onye aha ya bụkwa Elimas (nʼihi nke a bụ aha ya ma asụgharịa ya) malitere igbochi ha site nʼimegharị onyeisi ahụ anya ka ọ ghara ịnabata okwukwe ahụ.

9Ma Sọl, onye aha ya bụkwa Pọl, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, legidere ya anya

10sị, “Gị nwa ekwensu, jupụtara nʼaghụghọ na nʼihe ọjọọ dị iche iche. Gị onye iro nke ezi omume niile. Ọ bụ na i gaghị akwụsị imerụ ụzọ niile ziri ezi nke Onyenwe anyị?

11Nʼihi ya lee, iwe nke Onyenwe anyị ga-adakwasị gị. Ị ga-ekpụ ìsì nwa oge, ị gaghị enwe ike hụ ìhè nke anyanwụ.” Nʼotu oge ahụ, ọ hụkwaghị ụzọ ọzọ. Ọ malitere na-ebigharị aka, na-achọkwa onye ga na-edugharị ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.