12Mmadụ niile nọdụrụ nwayọọ, ha bidoro ige ntị nʼakụkọ Banabas na Pọl na-akọrọ ha banyere ihe ịrịbama niile na ọrụ ebube niile Chineke jiri ha rụọ nʼetiti ndị mba ọzọ.
13Mgbe ha kwusiri okwu ndị a, Jemis sịrị, “Ụmụnna m geenụ ntị.
14Saimọn akọọlara anyị otu Chineke si buru ụzọ lekọta ndị mba ọzọ site na isite nʼetiti ha họpụtara onwe ya ndị ga-ekwere na aha ya.
15Nke a na okwu ndị amụma dakọtara, dịka e dere ya,
16“ ‘Mgbe nke a gasịrị, aga m alọghachi, aga m ewughachikwa ụlọ ikwu Devid nke dara ada. Ebe ya niile dakpọsịrị adakpọsị ka m ga-ewugharịkwa, aga m emekwa ka ọ guzozie,