14Saimọn akọọlara anyị otu Chineke si buru ụzọ lekọta ndị mba ọzọ site na isite nʼetiti ha họpụtara onwe ya ndị ga-ekwere na aha ya.
15Nke a na okwu ndị amụma dakọtara, dịka e dere ya,
16“ ‘Mgbe nke a gasịrị, aga m alọghachi, aga m ewughachikwa ụlọ ikwu Devid nke dara ada. Ebe ya niile dakpọsịrị adakpọsị ka m ga-ewugharịkwa, aga m emekwa ka ọ guzozie,
17ka ndị fọdụrụ nʼetiti mmadụ nwe ike chọọ Onyenwe anyị, ọ bụladị ndị mba ọzọ niile ndị a kpọkwasịrị aha m, ka Onyenwe anyị kwuru, onye na-emekwa ihe ndị a.’
18Nke a amaara site na mgbe ochie.