16“ ‘Mgbe nke a gasịrị, aga m alọghachi, aga m ewughachikwa ụlọ ikwu Devid nke dara ada. Ebe ya niile dakpọsịrị adakpọsị ka m ga-ewugharịkwa, aga m emekwa ka ọ guzozie,
17ka ndị fọdụrụ nʼetiti mmadụ nwe ike chọọ Onyenwe anyị, ọ bụladị ndị mba ọzọ niile ndị a kpọkwasịrị aha m, ka Onyenwe anyị kwuru, onye na-emekwa ihe ndị a.’
18Nke a amaara site na mgbe ochie.
19“Nʼihi nke a, mkpebi ikpe m bụ nke a, ka anyị ghara isogbu ndị mba ọzọ lọghachikwutere Chineke,
20kama o kwesiri ka anyị degara ha akwụkwọ gwa ha sị ha hapụ iri nri ọbụla e ji chụọrọ arụsị aja. Ka ha wezugakwa onwe ha site na mmehie ịkwa iko, ya na iri anụ a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara.