17ka ndị fọdụrụ nʼetiti mmadụ nwe ike chọọ Onyenwe anyị, ọ bụladị ndị mba ọzọ niile ndị a kpọkwasịrị aha m, ka Onyenwe anyị kwuru, onye na-emekwa ihe ndị a.’
18Nke a amaara site na mgbe ochie.
19“Nʼihi nke a, mkpebi ikpe m bụ nke a, ka anyị ghara isogbu ndị mba ọzọ lọghachikwutere Chineke,
20kama o kwesiri ka anyị degara ha akwụkwọ gwa ha sị ha hapụ iri nri ọbụla e ji chụọrọ arụsị aja. Ka ha wezugakwa onwe ha site na mmehie ịkwa iko, ya na iri anụ a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara.
21Site na mbụ, Mosis nwere ndị na-ekwusa iwu nʼobodo niile. A na-agụkwa ya nʼụlọ nzukọ nʼụbọchị izuike niile.”