Ọrụ Ndị Ozi 15

Mgbe ha nọ tulegide okwu ahụ ruo oge dị anya, Pita guzoro ọtọ sị ha, “Ụmụnna m, unu niile maara na site na mbụ Chineke họpụtara m site nʼetiti unu, ka m zisaa oziọma ahụ nye ndị mba ọzọ ka ha nụrụ, ma kwerekwa.

Acts 15:7 (UKJV) And when there had been much disputing, Peter rose up, and said unto them, Men and brethren, all of you know how that a good while ago God made choice among us, that the Gentiles by my mouth should hear the word of the gospel, and believe.

5Ma ụfọdụ ndị kwere ekwe si nʼotu ndị Farisii biliri na-ekwu sị, “Na ọ dị mkpa ka e bie ha ugwu ma gwakwa ha ka ha dobe iwu Mosis.”

6Mgbe ahụ, ndị ozi na ndị okenye zukọtara itule okwu a.

7Mgbe ha nọ tulegide okwu ahụ ruo oge dị anya, Pita guzoro ọtọ sị ha, “Ụmụnna m, unu niile maara na site na mbụ Chineke họpụtara m site nʼetiti unu, ka m zisaa oziọma ahụ nye ndị mba ọzọ ka ha nụrụ, ma kwerekwa.

8Chineke a, onye maara obi mmadụ niile gbaara ha akaebe site nʼinye ha onyinye Mmụọ Nsọ dịka anyị si nata ya na mbụ.

9O gosighị na o nwere ihe dị iche nʼetiti anyị na ha. Nʼihi na o mere ka obi ha dị ọcha site nʼokwukwe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.