1Pọl bịaruru Debi na Listra, ebe otu onye na-eso ụzọ Jisọs a na-akpọ Timoti bi. Nne ya bụ onye Juu bụrụkwa onye kwere ekwe, ma nna ya bụ onye Griik.
2Ụmụnna ndị bi na Listra na Aikoniọm gbara ezi ama banyere ya.
3Pọl chọrọ ka Timoti soro ya nʼije ya. Ma nʼihi ndị Juu bi nʼakụkụ ebe ahụ, o biri ya ugwu nʼihi na mmadụ niile maara na nna ya bụ onye Griik.