Ọrụ Ndị Ozi 16

Ụmụnna ndị bi na Listra na Aikoniọm gbara ezi ama banyere ya.

Acts 16:2 (UKJV) Which was well reported of by the brethren that were at Lystra and Iconium.

1Pọl bịaruru Debi na Listra, ebe otu onye na-eso ụzọ Jisọs a na-akpọ Timoti bi. Nne ya bụ onye Juu bụrụkwa onye kwere ekwe, ma nna ya bụ onye Griik.

2Ụmụnna ndị bi na Listra na Aikoniọm gbara ezi ama banyere ya.

3Pọl chọrọ ka Timoti soro ya nʼije ya. Ma nʼihi ndị Juu bi nʼakụkụ ebe ahụ, o biri ya ugwu nʼihi na mmadụ niile maara na nna ya bụ onye Griik.

4Dịka ha na-eme njem site nʼobodo ruo nʼobodo, ha na-akọwara ha ihe banyere mkpebi ndị ozi na ndị okenye kpebiri na Jerusalem ka ha nwe ike idebe ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.