8Ka ha si nʼakụkụ Misia gafee, ha batara Troas.
9Nʼabalị ahụ, Pọl hụrụ ọhụ ebe ọ hụrụ otu nwoke onye Masidonia ka o guzo na-arịọ ya sị, “Bịa na Masidonia nyere anyị aka.”
10Mgbe ọ hụchara nke a, anyị jikeere ngwangwa ịga Masidonia ebe anyị mara na Chineke akpọọla anyị ịgbasara ha oziọma.
11Anyị banyere ụgbọ mmiri na Troas sị ya gafee Samotres. Nʼechi ya, anyị bịaruru Niapolis.
12Site nʼebe ahụ anyị jeruru Filipai nke bụ isi obodo dị nʼakụkụ mpaghara Masidonia bụrụkwa otu akụkụ nʼebe ndị Rom na-achị. Anyị nọdụrụ nʼime obodo a ọtụtụ ụbọchị.