Ọrụ Ndị Ozi 18

Nwoke a natara ozizi banyere ụzọ Onyenwe anyị. O sitekwara nʼịnụ ọkụ nke obi kuzie nnọọ ihe ziri ezi banyere Jisọs. Ma ihe ọ maara bụ naanị ihe gbasara baptizim Jọn mere.

Acts 18:25 (UKJV) This man was instructed in the way of the Lord; and being fervent in the spirit, he spoke and taught diligently the things of the Lord, knowing only the baptism of John.

23Mgbe ọ nọsịrị nwa oge nta nʼebe ahụ, ọ sitere nʼebe ahụ pụọ jegharịa nʼakụkụ obodo Galeshịa na Frigia na-agba ndị na-eso ụzọ ahụ ume.

24Ma otu nwoke onye Juu, aha ya bụ Apọlọs, onye Alegzandria bịara na Efesọs. Ọ bụ onye ọka okwu, bụrụkwa onye maara ihe edere nʼAkwụkwọ Nsọ nke ọma.

25Nwoke a natara ozizi banyere ụzọ Onyenwe anyị. O sitekwara nʼịnụ ọkụ nke obi kuzie nnọọ ihe ziri ezi banyere Jisọs. Ma ihe ọ maara bụ naanị ihe gbasara baptizim Jọn mere.

26Ma ọ nọgidesịrị ike na-ekwuwa okwu nʼụlọ nzukọ. Mgbe Prisila na Akwila nụrụ okwu ya, ha jekwuru ya, duru ya gaa nʼụlọ, were nwayọọ kọwaara ya ihe niile banyere ụzọ Chineke.

27Mgbe o zubere ịga obodo Akaịa, ndị ụmụnna gbara ya ume. Ha degaara ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ akwụkwọ ka ha nabata ya. Mgbe ọ bịaruru, Onyenwe anyị sitere nʼaka ya mee ka amara ya baa ụba nʼebe ndị kwere ekwe nọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.