21Mgbe ọ na-ahapụ, ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na Chineke kwe, aga m alọghachikwute unu ọzọ.” Emesịa ọ banyere nʼụgbọ hapụ Efesọs.
22Mgbe ọ kwụsịrị na Sizaria, ọ gara leta chọọchị dị nʼebe ahụ kelee ha. Emesịa, ọ gara nʼihu ruo Antiọk.
23Mgbe ọ nọsịrị nwa oge nta nʼebe ahụ, ọ sitere nʼebe ahụ pụọ jegharịa nʼakụkụ obodo Galeshịa na Frigia na-agba ndị na-eso ụzọ ahụ ume.
24Ma otu nwoke onye Juu, aha ya bụ Apọlọs, onye Alegzandria bịara na Efesọs. Ọ bụ onye ọka okwu, bụrụkwa onye maara ihe edere nʼAkwụkwọ Nsọ nke ọma.
25Nwoke a natara ozizi banyere ụzọ Onyenwe anyị. O sitekwara nʼịnụ ọkụ nke obi kuzie nnọọ ihe ziri ezi banyere Jisọs. Ma ihe ọ maara bụ naanị ihe gbasara baptizim Jọn mere.