19Mgbe ha rutere Efesọs, ọ hapụrụ ha nʼebe ahụ, ma o bu ụzọ banye nʼụlọ nzukọ ebe ya na ndị Juu nwere mkparịta ụka.
20Ma mgbe ha rịọrọ ya ka ọ nọnyetụkwuoro ha ogologo oge, ọ kweghị.
21Mgbe ọ na-ahapụ, ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na Chineke kwe, aga m alọghachikwute unu ọzọ.” Emesịa ọ banyere nʼụgbọ hapụ Efesọs.
22Mgbe ọ kwụsịrị na Sizaria, ọ gara leta chọọchị dị nʼebe ahụ kelee ha. Emesịa, ọ gara nʼihu ruo Antiọk.
23Mgbe ọ nọsịrị nwa oge nta nʼebe ahụ, ọ sitere nʼebe ahụ pụọ jegharịa nʼakụkụ obodo Galeshịa na Frigia na-agba ndị na-eso ụzọ ahụ ume.