Ọrụ Ndị Ozi 18

Mgbe o zubere ịga obodo Akaịa, ndị ụmụnna gbara ya ume. Ha degaara ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ akwụkwọ ka ha nabata ya. Mgbe ọ bịaruru, Onyenwe anyị sitere nʼaka ya mee ka amara ya baa ụba nʼebe ndị kwere ekwe nọ.

Acts 18:27 (UKJV) And when he was disposed to pass into Achaia, the brethren wrote, exhorting the disciples to receive him: who, when he was come, helped them much which had believed through grace:

25Nwoke a natara ozizi banyere ụzọ Onyenwe anyị. O sitekwara nʼịnụ ọkụ nke obi kuzie nnọọ ihe ziri ezi banyere Jisọs. Ma ihe ọ maara bụ naanị ihe gbasara baptizim Jọn mere.

26Ma ọ nọgidesịrị ike na-ekwuwa okwu nʼụlọ nzukọ. Mgbe Prisila na Akwila nụrụ okwu ya, ha jekwuru ya, duru ya gaa nʼụlọ, were nwayọọ kọwaara ya ihe niile banyere ụzọ Chineke.

27Mgbe o zubere ịga obodo Akaịa, ndị ụmụnna gbara ya ume. Ha degaara ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ akwụkwọ ka ha nabata ya. Mgbe ọ bịaruru, Onyenwe anyị sitere nʼaka ya mee ka amara ya baa ụba nʼebe ndị kwere ekwe nọ.

28Nʼihi na nʼihu ndị mmadụ niile, o guzoro kwuo okwu megide ozizi ọjọọ na ịrụ ụka niile nke ndị Juu. O gosiri ha site nʼakwụkwọ nsọ na Jisọs bụ Kraịst ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.